JENESIS 4:3-7
JENESIS 4:3-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara ONYENWE ANYị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye. Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. ONYENWE ANYị nabatara Ebel na onyinye ya, ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ. Ma ONYENWE ANYị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”
JENESIS 4:3-7 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma: ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua. Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru? Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.