JENESIS 4:13-17
JENESIS 4:13-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ken zara ONYENWE ANYị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu. Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.” ONYENWE ANYị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, ONYENWE ANYị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya. Ken sitere nʼihu ONYENWE ANYị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden. Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.
JENESIS 4:13-17 Bible Nso (IGBOB)
Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu. Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um. Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya. Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden. Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.