JENESIS 38:25-26
JENESIS 38:25-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
Kesaa
Gụọ JENESIS 38JENESIS 38:25-26 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka. Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.
Kesaa
Gụọ JENESIS 38