Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 38:1-30

JENESIS 38:1-30 Bible Nso (IGBOB)

O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira. Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya. Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia. Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan. Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya. Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua. Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi. Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru. Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa. Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya. Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu. Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya. O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye. Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n'ihi na o kpuchiri iru-ya. O we si n'ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n'uzọ, si, Biko, ngwa, ka m'bakuru gi: n'ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum? Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n'ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya? Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya. Tema we bilie, la, chipu ákwà-nkpudo-ya n'aru ya, yiri uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya. Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya. O we jua ndikom nke ebe-ya, si, Òle ebe nwayi ahu edoro nsọ ikwa iko nọ, bú nwayi ahu nke nọduru n'Enaim n'uzọ? Ha si, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a. Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a. Juda we si, Ka o were ya n'onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya. O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku. Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka. Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli. O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya. O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta. O rue na, ka ọ nēseghachi aka-ya, le, nwa-nne-ya nwoke putara: nwayi ahu we si, Gini mere i ji tiwara onwe-gi ntiwa? ewe kpọ aha-ya Perez. Emesia nwa-nne-ya nwoke putara, bú nke nwere ogho uhie n'aka-ya: ewe kpọ aha-ya Zera.

JENESIS 38:1-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira. Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya. Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan. Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya. Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama. Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị. ONYENWE ANYị gburu ya. Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. Nʼihi ya ONYENWE ANYị gbukwara ya. Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya. Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị. A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.” O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?” Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?” Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ. Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya. Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.” Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez. Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.