JENESIS 37:5-11
JENESIS 37:5-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa. Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ. Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.” Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile. Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.” Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?” Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.
JENESIS 37:5-11 Bible Nso (IGBOB)
Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari. Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m'rọworo: ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem. Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile. Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem. Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi? Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.