JENESIS 37:19-22
JENESIS 37:19-22 Bible Nso (IGBOB)
Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu. Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya. Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n'olùlù a nke di n'ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n'aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya.
JENESIS 37:19-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.” Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.” Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.