JENESIS 36:31-43
JENESIS 36:31-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha. Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba. Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze. Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze. Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit. Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze. Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze. Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze. Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet, Oholibama, Elaa, Pinon, Kenaz, Teman, Mibza, Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị.
JENESIS 36:31-43 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel. Bela nwa Beoa bu eze n'Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba. Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya. Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya. Husham we nwua, Hedad nwa Bedad, onye tib͕uru Midian n'ọhia Moab, we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit. Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n'ọnọdu ya. Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n'usọ Osimiri, we buru eze n'ọnọdu ya. Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n'ọnọdu ya. Beal-hanan nwa Akboa we nwua, Heda we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Pau; aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahad. Ndia bu kwa aha ndi-isi Isọ, dika ab͕uru nile ha si di, dika ebe nile si di, n'aha nile ha; Timna onye-isi, Alva onye-isi, Jetet onye-isi; Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi; Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi; Magdiel onye-isi, Iram onye-isi: ndia bu ndi-isi Edom, dika ebe-obibi-ha si di n'ala onwunwe-ha. Onye ahu bu Isọ nna Edom.