JENESIS 36:20-30
JENESIS 36:20-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor. Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan. Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn. Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana. Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran. Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran. Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana, ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
JENESIS 36:20-30 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n'ala Edom. Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna. Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam. Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere. Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana. Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran. Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran. Ndia bu ndi-isi ndi Hoa; Lotan onye-isi, Shobal onye-isi, Zibeon onye-isi, Ana onye-isi, Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n'ala Sia.