JENESIS 33:1-20
JENESIS 33:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ. O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ. Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso. Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa. Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.” Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala. Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala. Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?” Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.” Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.” Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m. Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ. Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.” Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ. Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.” Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.” Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.” Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ. Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt. Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ. Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ. Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.
JENESIS 33:1-20 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi. Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha. Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso. Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n'olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá. Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara. Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala. Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala. Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem. Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere. Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ. Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya. Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m'je kwa n'iru gi. Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa, Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia. Isọ we si, Biko, ka m'chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n'ebe i nọ. Ọ si, N'ìhi gini kwa? ka m'huta amara n'iru onye-nwem. Isọ we laghachi ubọchi ahu n'uzọ-ya ije Sia. Jekob we bulie ije rue Sukot, wuere onwe-ya ulo, ma-kwa-ra anu-ulo-ya ulo-ntu: n'ihi nka akpọrọ aha ebe ahu Sukot. Jekob we biarue Shelem, bú obodo Shekem, nke di n'ala Kenean, mb͕e o siri na Padan-eram bia; ọ ma ulo-ikwū-ya n'iru obodo ahu. O we zuta òkè ọhia ahu, ebe ọ b͕asara ulo-ikwū-ya, n'aka umu Hemoa, bú nna Shekem, n'ọgu nkpuru-ego ise. O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n'ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.