Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 32:7-21

JENESIS 32:7-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya. O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.” Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, ONYENWE ANYị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’ Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ. Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha. Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ. Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20) Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10). O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.” O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’ Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ” Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya. Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.” Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.

JENESIS 32:7-21 Bible Nso (IGBOB)

Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n'-omuma-ulo-ikwū abua; ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu. Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma: ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua. Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya. Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di. O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya; ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu, orú camel na iri nēnye umu ara na umu-ha, ọgu nne-ehi abua na oké-ehi iri, orú nne-inyinya-ibu na umu-inyinya-ibu iri. Ọ nye ha n'aka ndi-orù-ya, n'ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n'irum, me kwa mbara n'etiti ìgwè na ìgwè. Ọ we nye onye mbu iwu, si, Mb͕e Isọ, bú nwa-nnem, gēzute gi, jua gi, si, Ònye nwe gi? òle ebe i nēje kwa? ọ̀ bu kwa onye nwe ihe ndia di n'iru gi? I gāsi kwa, Orù-gi Jekob nwe ha; onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu ezitere onye-nwem Isọ: ma, le, ya onwe-ya nọ kwa n'azu ayi. Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya; unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n'azu ayi. N'ihi na ọ siri, Ka m'were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n'irum kpuchie anya-ya, emesia m'gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma. Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n'iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu.