JENESIS 30:25-43
JENESIS 30:25-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m. Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.” Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na ONYENWE ANYị agọziela m nʼihi gị.” Leban sịrị, “Kwuo ego ole ị chọrọ ka m kwụọ gị, aga m akwụ ya.” Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara. Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. ONYENWE ANYị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?” Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị. Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m. Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.” Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.” Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha. Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ. Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè. Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri, ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ. Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban. Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha. Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb. Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.
JENESIS 30:25-43 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam. Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi. Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi. Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m'gēnye kwa gi. Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam. N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom? Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya. M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum. Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam. Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di. O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom; o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru. Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè. O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri. Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ. Jekob we wezuga umu-aturu, me ka ìgwè ewu na aturu che iru na nke dere ọcha na nke ọ bula di nji n'ìgwè ewu na aturu Leban; o we do ìgwè nke aka ya n'onwe-ha iche, ma o doghi ha n'ebe ìgwè ewu na aturu Leban di. O rue, mb͕e ọ bula ndi di ike nime ìgwè ewu na aturu turu ime, na Jekob tọb͕ọrọ nkpa-n'aka ahu n'iru anya ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri, ka ha we turu ime n'etiti nkpa-n'aka ahu; ma mb͕e ìgwè ewu na aturu nādighi ike, ọ dighi-atọb͕ọ ha: ndi nādighi ike we diri Leban, ma ndi di ike diri Jekob. Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.