JENESIS 3:9-15
JENESIS 3:9-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ONYENWE ANYị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” ONYENWE ANYị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” Ya mere, ONYENWE ANYị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
JENESIS 3:9-15 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ? O we si, Anurum olu-Gi n'ubi a ab͕ara ogige, m'we tua egwu, n'ihi na onye b͕a ọtọ ka m'bu; m'we zo onwem. O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya? Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n'osisi ahu, m'we rie. Jehova, bú Chineke, we si nwayi ahu, Gini bu nka i meworo? Nwayi we si, Agwọ ahu rafurum, m'we rie. Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N'ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi: iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.