JENESIS 3:6-8
JENESIS 3:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie. Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa. Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị ONYENWE ANYị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe ONYENWE ANYị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ.
JENESIS 3:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie. Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké. Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige.