JENESIS 3:20-24
JENESIS 3:20-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ. Emesịa, ONYENWE ANYị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. ONYENWE ANYị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.
JENESIS 3:20-24 Bible Nso (IGBOB)
Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n'ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu. Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha. Jehova, bú Chineke, we si, Le, madu ahu aghọwo ihe di ka otù onye nime ayi, n'ima ezi ihe na ihe ọjọ; ma ub͕u a, ka o we ghara iseti aka-ya, were nkpuru sitere n'osisi ahu nke ndu, rie, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya. O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n'akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.