JENESIS 29:31-35
JENESIS 29:31-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ONYENWE ANYị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga. Lịa tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Ruben. Nʼihi na o kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYị ahụla nsogbu m, ugbu a di m ga-ahụ m nʼanya.” Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọkwa nwa nwoke. O kwuru sị, “ONYENWE ANYị anụla na m bụ nwanyị a kpọrọ asị, ọ bụ ya mere o ji nye m nwa nwoke ọzọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Simiọn. Lịa tụrụ ime ọzọ, mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru sị, “Nʼezie, ugbu a ka di m ga-arapara m nʼahụ, nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom atọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Livayị. Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke. O kwuru sị, “Ugbu a aga m eto ONYENWE ANYị.” Ya mere, ọ kpọrọ aha ya Juda. Lịa mụsịrị nwa a kwụsị ịmụ ụmụ.
JENESIS 29:31-35 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà. Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N'ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m'bu, n'ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon. Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.