JENESIS 28:20-22
JENESIS 28:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, ONYENWE ANYị ga-abụ Chineke m. Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
Kesaa
Gụọ JENESIS 28JENESIS 28:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie, m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke, nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.
Kesaa
Gụọ JENESIS 28