JENESIS 28:16-22
JENESIS 28:16-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie ONYENWE ANYị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.” Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.” Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya. Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ. Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, ONYENWE ANYị ga-abụ Chineke m. Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
JENESIS 28:16-22 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya. Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe. Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya. Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu. Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie, m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke, nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.