JENESIS 28:10-22
JENESIS 28:10-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran. Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra. Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa. Nʼelu ya, ọ hụrụ ONYENWE ANYị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya. Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a. Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.” Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie ONYENWE ANYị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.” Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.” Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya. Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ. Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, ONYENWE ANYị ga-abụ Chineke m. Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
JENESIS 28:10-22 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran. Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya. Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi; nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi. Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya. Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya. Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe. Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya. Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu. Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie, m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke, nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.