JENESIS 26:1-5
JENESIS 26:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera. ONYENWE ANYị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya. Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị. Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa. Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”
JENESIS 26:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Oké unwu we di n'ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n'ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera. Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n'Ijipt; biri n'ala ahu nke M'gāsi gi biri: nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi; M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na Abraham gere nti n'olum, we debe ihe-ndebem, ihe nile M'nyere n'iwu, ukpurum nile, na iwum nile.