JENESIS 25:29-34
JENESIS 25:29-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.) Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.” Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?” Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya. Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
JENESIS 25:29-34 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà: Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom. Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi. Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara? Jekob we si, Buru uzọ ṅuaram iyi; ọ ṅuara ya iyi: ọ we rebe Jekob ọnọdu-ọkpara-ya. Jekob we nye Isọ achicha na ofé lentil; o rie ṅu kwa, o bilie, je nke ya: Isọ we leda ọnọdu-ọkpara-ya anya.