JENESIS 25:19-34
JENESIS 25:19-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik. Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram. Aịzik kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. ONYENWE ANYị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime. Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka ONYENWE ANYị. ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya. Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ. Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha. Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu. Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya. Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.) Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.” Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?” Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya. Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
JENESIS 25:19-34 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak: Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria. Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime. Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase. Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà. Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya. Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ. Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha. Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū. Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya. Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà: Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom. Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi. Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara? Jekob we si, Buru uzọ ṅuaram iyi; ọ ṅuara ya iyi: ọ we rebe Jekob ọnọdu-ọkpara-ya. Jekob we nye Isọ achicha na ofé lentil; o rie ṅu kwa, o bilie, je nke ya: Isọ we leda ọnọdu-ọkpara-ya anya.