JENESIS 24:12-19
JENESIS 24:12-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “ONYENWE ANYị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị. Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri. Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.” Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya. Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta. Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.” Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.” Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
JENESIS 24:12-19 Bible Nso (IGBOB)
Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere. Le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; umu-ndinyom nke ndi obodo a nāputa kwa isere miri: ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọghọ ahu onye m'gāsi, Biko, zie ite-gi ka m'ṅua; onye gāsi kwa, Ṅua, ọzọ kwa, camel-gi ka m'gēme ka ha ṅua: ka ọ buru nwayi ahu ka I rọputaworo nye orù-gi, bú Aisak; ọ bu kwa nime nka ka m'gāmara na I meworo onye-nwem ebere. O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n'ubu-ya. Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n'isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota. Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m'ṅua nwantī miri site n'ite-gi. Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n'aka-ya, me ka ọ ṅua. Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m'gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori.