JENESIS 21:1-3
JENESIS 21:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru. Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya. Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak.
Kesaa
Gụọ JENESIS 21JENESIS 21:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. ONYENWE ANYị meere Sera ihe o kwere na nkwa. Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
Kesaa
Gụọ JENESIS 21