JENESIS 2:21-25
JENESIS 2:21-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ONYENWE ANYị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.
JENESIS 2:21-25 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n'ọnọdu-ya: ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu. Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke. N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru. Ha abua we buru ndi b͕a ọtọ, nwoke ahu na nwunye-ya, ma ihere adighi-eme ha.