JENESIS 2:15-20
JENESIS 2:15-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya. ONYENWE ANYị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a, ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.” ONYENWE ANYị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.” ONYENWE ANYị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya. Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya.
JENESIS 2:15-20 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya. Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri: ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu. Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya. Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya. Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya.