JENESIS 18:16-21
JENESIS 18:16-21 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha. Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme; ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya? N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya. Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie; ka M'rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M'mara.
JENESIS 18:16-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ONYENWE ANYị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime? Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya. Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ ONYENWE ANYị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka ONYENWE ANYị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke. Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.”