JENESIS 17:17-19
JENESIS 17:17-19 Bible Nso (IGBOB)
Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa? Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi! Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.
JENESIS 17:17-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?” Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.” Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.