JENESIS 17:1-8
JENESIS 17:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, ONYENWE ANYị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.” Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị, “Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.”
JENESIS 17:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè. M'gētiye kwa ọb͕ub͕a-ndum n'etiti Mu na gi, me ka i ba uba nke-uku nke-uku. Abram we da kpu iru-ya n'ala: Chineke we kpayere ya uka, si, Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n'ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba. Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n'ihi na nna nke ìgwè mba ka M'meworo gi. M'gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M'gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta. M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke. M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.