JENESIS 15:12-21
JENESIS 15:12-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ. Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta. Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka. Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.” Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee. Nʼụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”
JENESIS 15:12-21 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya. Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ; ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta. Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ. Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi. O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu. N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis: ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na Refaim, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Giagashait, na ndi Jebus.