JENESIS 15:1-21
JENESIS 15:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe nke a gasịrị, okwu ONYENWE ANYị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.” Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” Ma okwu ONYENWE ANYị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” Ebram kweere nʼihe ONYENWE ANYị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. ONYENWE ANYị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.” Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” ONYENWE ANYị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ. Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha. Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ. Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta. Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka. Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.” Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee. Nʼụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”
JENESIS 15:1-21 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku. Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza? Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem. Ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si, Nwoke a agaghi-enweta ihe-gi; kama onye gēsi n'afọ-gi puta, onye ahu gēnweta ihe-gi. O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi. Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume. Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya. Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya? Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu. O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n'etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu. Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha. O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya. Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ; ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta. Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ. Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi. O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu. N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis: ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na Refaim, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Giagashait, na ndi Jebus.