Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 13:8-18

JENESIS 13:8-18 Bible Nso (IGBOB)

Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu. Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe. Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa. Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya. Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm. Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku. Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu: n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi. Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya. Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.

JENESIS 13:8-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne. Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.” Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige ONYENWE ANYị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu ONYENWE ANYị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.) Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara. Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm. Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide ONYENWE ANYị. Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, ONYENWE ANYị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị. Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.” Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYị nʼebe ahụ.