JENESIS 13:8-13
JENESIS 13:8-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne. Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.” Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige ONYENWE ANYị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu ONYENWE ANYị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.) Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara. Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm. Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide ONYENWE ANYị.
JENESIS 13:8-13 Bible Nso (IGBOB)
Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu. Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe. Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa. Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya. Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm. Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.