JENESIS 12:10-20
JENESIS 12:10-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge. Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma. Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ. Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.” Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma. Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero. Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel. Ma ONYENWE ANYị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram. Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị? Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwanyị, si otu a mee m ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Ugbu a, lee nwunye gị, kpọrọ ya laa.” Fero nyere iwu banyere Ebram na ndị ikom so ya. Ha zilagara ya, ya na nwunye ya, na ihe niile o nwere.
JENESIS 12:10-20 Bible Nso (IGBOB)
Oké unwu we di n'ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n'ebe ahu dika ọbìa; n'ihi na oké unwu ahu di ike n'ala. O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n'Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu: O gēru kwa, mb͕e ndi Ijipt gāhu gi, na ha gāsi, Nwunye-ya ka nwayi a bu: ha ewe b͕uem, ma gi ka ha gēdebe ndu. Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi. O rue, mb͕e Abram batara n'Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu. Ndi-isi Fero we hu ya, too ya n'iru Fero: ewe kubata nwayi ahu n'ulo Fero. Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel. Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram. Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n'ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu? N'ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m'we luta ya n'onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la. Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.