JENESIS 11:1-9
JENESIS 11:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu. Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ. Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.” ONYENWE ANYị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. ONYENWE ANYị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime. Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.” ONYENWE ANYị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ONYENWE ANYị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ONYENWE ANYị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
JENESIS 11:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu. O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu. Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ. Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile. Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru. Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime. Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha. Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.