Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 10:1-32

JENESIS 10:1-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị. Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras. Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama. Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim. (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.) Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan. Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan. Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa. Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu ONYENWE ANYị.” Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna. Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala, na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ. Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh, ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto. Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het, ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash, ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini, ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara, oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche. A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara. Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek. Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba. Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan. Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera, Hadoram, Ụzal, Dikla, Obal, Abimael, Sheba, Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan. Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche. Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.

JENESIS 10:1-32 Bible Nso (IGBOB)

Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri. Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras. Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama. Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim. Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha. Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean. Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan. Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa. Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova. Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina. O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala, na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu). Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim, na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim. Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het; na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait; na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin; na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa. Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha. Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha. Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet. Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram. Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash. Apakshad muru Shela; Shela muru Iba. Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan. Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera; na Hadoram, na Uzal, na Dikla; na Obal, na Abimael, na Sheba; na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan. Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu. Ndia bu umu-ndikom Shem, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, dika mba nile ha si di. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Noa, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nime mba nile ha: site kwa na ndia ka ekesara mba nile n'uwa, mb͕e iju-miri ahu gasiri.