NDI GALETIA 4:4-7
NDI GALETIA 4:4-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke.
NDI GALETIA 4:4-7 Bible Nso (IGBOB)
ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu, ka O we b͕aputa ndi nọ n'okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu. Ma n'ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna. Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n'aka Chineke.