NDI GALETIA 1:11-20
NDI GALETIA 1:11-20 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m'zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara. N'ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist. N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya: anamaga-kwa-ri n'iru n'uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n'etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n'aka idebe. Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm, mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù: arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ. Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise. Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi. Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.
NDI GALETIA 1:11-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị. Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha.