Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZRA 6:13-22

EZRA 6:13-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla. Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu. Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs. Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya. Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị. Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ. Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ ONYENWE ANYị, Chineke nke Izrel. Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na ONYENWE ANYị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.

EZRA 6:13-22 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me. Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu. Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a. Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n'umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke. Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di. Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses. Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu. N'ihi na ndi-nchu-àjà na ndi Livai mere onwe-ha ka ha di ọcha n'otù; ha nile di ọcha: ha we b͕uere umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ anu ngabiga, b͕u-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà, b͕u-kwa-ra onwe-ha. Umu Israel we rie, bú ndi nēsi n'etiti ndi emere ka ha je birl n'ala ọzọ lata, ha na onye ọ bula nke nēkewapu onwe-ya n'ọrurú nke mba nile nke ala ahu iso ha, ichọ Jehova, bú Chineke Israel, ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.