EZRA 4:1-23
EZRA 4:1-23 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nākpab͕u Juda na Benjamin we nu na umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ nēwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo uku; ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a. Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu. O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n'iwu ulo, ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia. Ma n'ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem. N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria. Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a: mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam, na mba fọduru ndi Ọsnapa di uku di kwa ebube mere ka ha bia biri n'ala a, o we me ka ha nọdu n'obodo Sameria, ha na ndi fọduru n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a. Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a. Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n'ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile. Ub͕u a, ka eze mara, na, ọ buru na ewue obodo a, wuzu kwa mb͕idi-ya nile, ọ dighi utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ, ha gātu, ma n'ikpe-azu ọ gēme ka ihe funari ndi-eze. Ub͕u a, n'ihi na nnú ulo uku eze bu nnú-ayi, na n'ihi na ayi enweghi ntachi-obi ihu ọtọ nke eze, ayi we zìe ozi me ka eze mara; ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe. Ayi onwe-ayi nēme ka eze mara na, ọ buru na ewue obodo a, luzu kwa mb͕idi-ya nile, n'ihi ya ọ dighi òkè i gēnwe n'ofè osimiri. Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a. Akwukwọ-ozi ahu nke unu zitere ayi, aguputawo ya nke-ọma n'irum. M'we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya. Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ. Ub͕u a nyenu iwu ime ka ndikom a kwusi, ka aghara kwa iwu obodo a, rue mb͕e m'gēnye iwu. Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n'ime ihe a: n'ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze. Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.
EZRA 4:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị iro Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.” Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru ONYENWE ANYị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.” Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ. Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa. Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem. Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik. Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya: “Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam, na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.” Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a. Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya. Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha. Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a. Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ. Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ. Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ, Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ndeewonụ. Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m. Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara. Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu. Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa? Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ.