EZIKIEL 47:12
EZIKIEL 47:12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”
Kesaa
Gụọ EZIKIEL 47EZIKIEL 47:12 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.
Kesaa
Gụọ EZIKIEL 47