EZIKIEL 34:25-31
EZIKIEL 34:25-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu. Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri. Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha. Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu. Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche. Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara. Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwubiri ya.’ ”
EZIKIEL 34:25-31 Bible Nso (IGBOB)
Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia. M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi. Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè. Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji. M'gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n'ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ. Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, bú ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim, madu ka unu bu, Mu onwem bu Chineke-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.