EZIKIEL 3:4-10
EZIKIEL 3:4-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile. Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel. Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị. Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike. Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha. Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.” Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
EZIKIEL 3:4-10 Bible Nso (IGBOB)
O we sim, Nwa nke madu, je, ba n'ulo Israel, were okwum nile gwa ha. N'ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel; ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti. Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu. Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha. Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.