EZIKIEL 28:15-17
EZIKIEL 28:15-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị. Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi. Obi gị jupụtara na nganga nʼihi ịma mma gị, i mere ka amamihe gị bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị. Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala, mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
EZIKIEL 28:15-17 Bible Nso (IGBOB)
Onye zuru okè ka i bu n'uzọ-gi nile n'ubọchi ekère gi, rue mb͕e ahuru ajọ omume nime gi. Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku. Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.