Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 22:23-30

EZIKIEL 22:23-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọzọkwa, okwu ONYENWE ANYị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’ E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya. Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha. Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha. Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị sịrị,’ mgbe ONYENWE ANYị na-ekwughị ihe ọbụla. Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi. “Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ.