Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 1:4-28

EZIKIEL 1:4-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ. Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ. Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma. Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị. Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga. Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo. Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha. Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ. Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta. Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu. Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya. Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu. Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga. Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa. Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal. Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya. Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu. Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube ONYENWE ANYị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.

EZIKIEL 1:4-28 Bible Nso (IGBOB)

M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu. Ọzọ, n'etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n'ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere. Ọzọ, iru anọ ka onye ọ bula nime ha nwere, ọ bu kwa nkù anọ ka onye ọ bula nime ha nwere. Ọzọ, ukwu nile ha bu ukwu guzoziri eguzozi; ọzọ, ọbu-ukwu nke ukwu nile ha di ka ọbu-ukwu nwa-ehi: ha neb͕u kwa maramara dika ib͕u-maramara ọla akwọchara akwọcha. Ha nwe-kwa-ra aka madu n'okpuru nkù-ha n'akuku anọ ha: ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha diri ha anọ otú a; ihe ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ka nkù nile ha bu; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya. Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra. Ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha kewara ekewa site n'elu; onye ọ bula nwere nkù abua ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ma nkù abua nēkpuchi aru-ha. Ọzọ, ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya: ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. Ma oyiyi nke ihe anọ ahu di ndu, ka ha si di n'ile ha anya, ha di ka icheku ọku nēre ọku, dika ọwa n'ile ha anya; ọku ahu nāga iru na azu n'etiti ihe anọ ahu di ndu: onwunwu di-kwa-ra ọku ahu, àmùmà nēsi kwa n'ọku ahu b͕uputa. Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya. M'we hu ihe anọ ahu di ndu, ma, le, otù wheel di n'ala n'akuku ihe ọ bula n'ihe anọ ahu di ndu, diri iru anọ ya n'otù n'otù. Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel. Ọ bu n'akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n'anya anya buruburu ha anọ. Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha. Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n'ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha. Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n'elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha. Ọzọ, oyiyi nke mbara-ígwé di n'elu isi ihe ahu di ndu, dika ib͕u-maramara crystal di egwu si di, nke esetiri eseti n'elu isi-ha n'elu. Ọzọ, n'okpuru mbara-ígwé ahu nkù nile ha guzoziri eguzozi, otù n'ebe ibe-ya di: ha nile n'otù n'otù nwere nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'otù akuku, ha nile n'otù n'otù nwe-kwa-ra nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'akuku ọzọ. Mb͕e ha nāga m'we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha. Olu we di n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha. Ọzọ, n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha oyiyi nke oche-eze di, dika nkume sapphire si di n'ile ya anya: ọzọ, n'elu oyiyi oche-eze ahu otù oyiyi di, nke di ka madu si di n'ile ya anya, n'elu oche-eze ahu n'elu. M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu. Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara