ỌPUPU 9:8-26
ỌPUPU 9:8-26 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero. Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile. Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile. Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses. Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile. N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa: ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile. Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha? Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a. Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n'ọhia ka ha laghachi n'ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n'ọhia, nke agaghi-achikọta ha n'ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua. Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo: ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n'ala Ijipt nile, n'aru madu, na n'aru anumanu, na n'aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n'ala Ijipt. Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt. Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n'etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n'ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba. Ákú-miri-ígwé ahu we tib͕ue ihe nile nke di n'ọhia, ma madu ma anumanu, n'ala Ijipt nile; ọ bu kwa ihe-ọkukú nile ọ bula nke ubi ka ákú-miri-ígwé ahu tiri, ọ bu kwa osisi nile ọ bula nke ọhia ka o tipiara. Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.
ỌPUPU 9:8-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero. Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.” Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile. Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ. Ma ONYENWE ANYị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka ONYENWE ANYị gwara Mosis na ọ ga-eme. ONYENWE ANYị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile. Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa. Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile. Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala. Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a. Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ” Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu ONYENWE ANYị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha. Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu ONYENWE ANYị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.” Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, ONYENWE ANYị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, ONYENWE ANYị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt. Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba. Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi. Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.