ỌPUPU 9:1-7
ỌPUPU 9:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.” Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha, aka ONYENWE ANYị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu. ONYENWE ANYị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ” ONYENWE ANYị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka ONYENWE ANYị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.” Nʼụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
ỌPUPU 9:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha, le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi. Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere. Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka. Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru. Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.