ỌPUPU 5:15-23
ỌPUPU 5:15-23 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we bia tikue Fero, si, N'ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a? Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo. Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n'ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà. Ma ub͕u a, jenu, fè òfùfè; n'ihi na agaghi-enye unu okporo-ọka, ma ọnu-ọgugu brick-unu ka unu gēnye. Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we hu ha na ha nọ n'ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya. Ha we zute Moses na Eron, ndi nēguzo onwe-ha izute ha, mb͕e ha si n'ebe Fero nọ puta: ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi. Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n'ihi gini bu nka na I zitewom? Ma site na mb͕e m'biakutere Fero ikwu okwu n'aha-Gi, ọ mejọwo ndi nka; I naputaghi kwa ndi-Gi ma-ọli.
ỌPUPU 5:15-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso? Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.” Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ ONYENWE ANYị aja.’ Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.” Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.” Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha. Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka ONYENWE ANYị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.” Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru ONYENWE ANYị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m? Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”