ỌPUPU 4:10-17
ỌPUPU 4:10-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mosis sịrị ONYENWE ANYị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.” ONYENWE ANYị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị? Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.” Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.” ONYENWE ANYị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị. Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme. Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu. Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”
ỌPUPU 4:10-17 Bible Nso (IGBOB)
Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu. Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu. Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga. Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya. I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme. Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke. Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.