Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 4:1-17

ỌPUPU 4:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘ONYENWE ANYị egosighị gị onwe ya.’ ” Ma ONYENWE ANYị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.” ONYENWE ANYị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ. ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka. ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na ONYENWE ANYị Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.” ONYENWE ANYị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ. Mgbe ahụ ONYENWE ANYị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a. Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.” Mosis sịrị ONYENWE ANYị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.” ONYENWE ANYị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị? Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.” Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.” ONYENWE ANYị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị. Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme. Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu. Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”

ỌPUPU 4:1-17 Bible Nso (IGBOB)

Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya. Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n'aka-gi? Ọ si, Nkpa-n'aka. Ọ si, Tuda ya n'ala. Ọ we tuda ya n'ala, o we ghọ agwọ; Moses we b͕apu n'iru ya. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi, jide ya n'ọdùdù: (ọ we setipu aka-ya, jide ya, ọ we ghọ nkpa-n'aka-ya:) ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya. Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n'obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n'obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe. Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n'obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n'obi-ya; ọ we weputa ya n'obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya.) O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu. O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n'ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n'osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n'ala-akọrọ. Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu. Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu. Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga. Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya. I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme. Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke. Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.